Abụ Ọma 52:3
Psalms 52:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị hụrụ ihe ọjọọ nʼanya karịa ihe ọma, ị hụrụ okwu ụgha nʼanya karịa eziokwu. Sela
Psalms 52:3 in English
Psalms 52:3 · Berean Standard Bible
You love evil more than good, falsehood more than speaking truth. Selah
Context
1Gịnị mere i ji na-anya isi nʼihe ọjọọ, gị nwoke dị ike?
Gịnị mere na ogologo ụbọchị niile, ị na-anya isi,
gị onye Chineke na-eleda anya? 2Ire gị na-atụ atụmatụ ịla nʼiyi;
ọ dị ka agụba dị nkọ,
gị onye na-ebi ndụ aghụghọ. 3Ị hụrụ ihe ọjọọ nʼanya karịa ihe ọma,
ị hụrụ okwu ụgha nʼanya karịa eziokwu. Sela 4O onye ire aghụghọ!
Ị hụrụ okwu ọbụla nke na-emegide mmadụ nʼanya. 5Nʼezie, Chineke ga-akwatu gị ruo mgbe ebighị ebi.
Ọ ga-ejide gị, dọpụta gị site nʼụlọ ikwu gị,*
ọ ga-ehopukwa gị site nʼala ndị dị ndụ. Sela
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.