Abụ Ọma 39:5
Psalms 39:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
I meela ka ụbọchị m niile bụrụ naanị ihe dị nta; ogologo afọ m niile adịghị ka ihe ọbụla nʼihu gị. Ndụ onye ọbụla bụ naanị otu nkuume ọbụladị ndị dịka ha guzosirike. Sela
Psalms 39:5 in English
Psalms 39:5 · Berean Standard Bible
You, indeed, have made my days as handbreadths, and my lifetime as nothing before You. Truly each man at his best exists as but a breath. Selah
Context
3Obi m kporo ọkụ nʼime m,
ma mgbe m na-atụgharị ihe ndị a nʼuche, ọkụ ahụ nọ na-ere;
mgbe ahụ ekwuru m okwu sị: 4“O Onyenwe anyị, gosi m ọgwụgwụ nke ndụ m
na ọnụọgụgụ ụbọchị m niile;
mee ka m mara na ndụ m na-agafe ngwangwa. 5I meela ka ụbọchị m niile bụrụ naanị ihe dị nta;
ogologo afọ m niile adịghị ka ihe ọbụla nʼihu gị.
Ndụ onye ọbụla bụ naanị otu nkuume
ọbụladị ndị dịka ha guzosirike. Sela 6“Nʼezie onye ọbụla na-ejegharị dịka onyinyo
nʼefu ka ha na-ekwogharị nʼotu ebe na nke ọzọ, na-akpakọba akụ,
na-amaghị onye ọ ga-abụ nke ya nʼikpeazụ. 7“Ma ugbu a, Onyenwe m, gịnị ka m na-ele anya ya?
Olileanya m dị nʼime gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.