Abụ Ọma 39:2
Psalms 39:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma mgbe m mechiri ọnụ m ma nọrọ duu, jụ ikwu ọ bụladị ihe ọbụla dị mma, oke ihe mgbu m mụbara.
Psalms 39:2 in English
Psalms 39:2 · Berean Standard Bible
I was speechless and still; I remained silent, even from speaking good, and my sorrow was stirred.
Context
1Asịrị m, “Aga m elezi anya nʼụzọ m niile
ma debe ire m ka m ghara ikwuhie*;
aga m eji ihe kechie ọnụ m
mgbe m nọ nʼetiti ndị ajọ omume.” 2Ma mgbe m mechiri ọnụ m ma nọrọ duu,
jụ ikwu ọ bụladị ihe ọbụla dị mma,
oke ihe mgbu m mụbara. 3Obi m kporo ọkụ nʼime m,
ma mgbe m na-atụgharị ihe ndị a nʼuche, ọkụ ahụ nọ na-ere;
mgbe ahụ ekwuru m okwu sị: 4“O Onyenwe anyị, gosi m ọgwụgwụ nke ndụ m
na ọnụọgụgụ ụbọchị m niile;
mee ka m mara na ndụ m na-agafe ngwangwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.