Abụ Ọma 39:1
Psalms 39:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Asịrị m, “Aga m elezi anya nʼụzọ m niile ma debe ire m ka m ghara ikwuhie*; aga m eji ihe kechie ọnụ m mgbe m nọ nʼetiti ndị ajọ omume.”
Psalms 39:1 in English
Psalms 39:1 · Berean Standard Bible
I said, “I will watch my ways so that I will not sin with my tongue; I will guard my mouth with a muzzle as long as the wicked are present.”
Context
1Asịrị m, “Aga m elezi anya nʼụzọ m niile
ma debe ire m ka m ghara ikwuhie*;
aga m eji ihe kechie ọnụ m
mgbe m nọ nʼetiti ndị ajọ omume.” 2Ma mgbe m mechiri ọnụ m ma nọrọ duu,
jụ ikwu ọ bụladị ihe ọbụla dị mma,
oke ihe mgbu m mụbara. 3Obi m kporo ọkụ nʼime m,
ma mgbe m na-atụgharị ihe ndị a nʼuche, ọkụ ahụ nọ na-ere;
mgbe ahụ ekwuru m okwu sị:
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.