Abụ Ọma 37:34
Psalms 37:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Chere Onyenwe anyị, debekwa ụzọ ya. Ọ ga-ebuli gị elu ka i nweta ala ahụ dịka ihe nketa; mgbe a na-egbuchapụ ndị ajọ omume, ị ga-eji anya gị hụ ya.
Psalms 37:34 in English
Psalms 37:34 · Berean Standard Bible
Wait for the LORD and keep His way, and He will raise you up to inherit the land. When the wicked are cut off, you will see it.
Context
32Ndị ajọ omume na-echere ndị ezi omume na nzuzo,
na-achọ ịnapụ ha ndụ ha; 33ma Onyenwe anyị agaghị ahapụ ha nʼaka ha,
ọ gaghị ekwe ka a maa ha ikpe mgbe a na-ekpe ha ikpe. 34Chere Onyenwe anyị,
debekwa ụzọ ya.
Ọ ga-ebuli gị elu ka i nweta ala ahụ dịka ihe nketa;
mgbe a na-egbuchapụ ndị ajọ omume, ị ga-eji anya gị hụ ya. 35Ahụla m onye ajọ omume na nwoke na-eme ihe ike,
ka ọ na-eto, na-awasa, dịka osisi dị ndụ nʼezi ala, 36ma ọ dịghị anya, ọ nwụrụ,
nʼagbanyeghị na m chọgharịrị ya, ọ dịghị ebe ọbụla a hụrụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.