Abụ Ọma 37:25
Psalms 37:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi, ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume, maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri.
Psalms 37:25 in English
Psalms 37:25 · Berean Standard Bible
I once was young and now am old, yet never have I seen the righteous abandoned or their children begging for bread.
Context
23Ọ bụrụ na Onyenwe anyị nwere mmasị na ndụ mmadụ,
ọ ga-eme ka nzọ ụkwụ ya guzosie ike; 24ọ bụrụ na ọ kpọbie ụkwụ, ọ gaghị ada,
nʼihi na Onyenwe anyị na-eji aka ya ejigide ya. 25Abụ m nwantakịrị na mbụ, ugbu a, abụ m agadi,
ma ahụbeghị m ebe e chefuru ndị ezi omume,
maọbụ ebe ụmụ ha na-arịọ nri. 26Mgbe niile, ha na-eme amara jiri obi ha na-agbazinye ndị mmadụ ihe,
ụmụ ha ga-abụ ngọzị. 27Site nʼihe ọjọọ pụọ, mee ezi ihe,
mgbe ahụ, i ga-ebi nʼala a ruo mgbe ebighị ebi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.