Abụ Ọma 34:18
Psalms 34:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso, ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ.
Psalms 34:18 in English
Psalms 34:18 · Berean Standard Bible
The LORD is near to the brokenhearted; He saves the contrite in spirit.
Context
16ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ,
ime ka a hapụ ichetakwa ihe banyere ha nʼụwa. 17Onyenwe anyị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka;
ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile. 18Onyenwe anyị na-anọ ndị niile obi ha tiwara etiwa nso,
ọ na-anapụta ndị niile olileanya ha gwụrụ. 19Nsogbu na-adakwasị ndị ezi omume na-adị ukwuu,
ma Onyenwe anyị na-anapụta ha site na nsogbu ndị ahụ niile. 20Ọ na-anapụtakwa ha kpamkpam.
Ọ gaghị ekwe ka ọ bụladị otu ọkpụkpụ dị ha nʼahụ gbajie.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.