Abụ Ọma 34:15
Psalms 34:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume, ntị ya gheekwa oghe nye mkpu akwa ha;
Psalms 34:15 in English
Psalms 34:15 · Berean Standard Bible
The eyes of the LORD are on the righteous, and His ears are inclined to their cry.*
Context
13chezie ire gị ka ọ ghara ikwu ihe ọjọọ,
chezikwaa egbugbere ọnụ gị ka ọ gharakwa ịgha ụgha. 14Site nʼihe ọjọọ wezuga onwe gị ma mee ezi ihe,
chọọ udo ma gbasookwa ya. 15Anya Onyenwe anyị dị nʼahụ ndị ezi omume,
ntị ya gheekwa oghe nye mkpu akwa ha; 16ma ihu Onyenwe anyị na-emegide ndị na-eme ihe ọjọọ,
ime ka a hapụ ichetakwa ihe banyere ha nʼụwa. 17Onyenwe anyị na-anụ olu ndị ezi omume, mgbe ha na-akpọku ya ka o nyere ha aka;
ọ na-azọpụtakwa ha site na nsogbu ha niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.