Abụ Ọma 25:5
Psalms 25:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe, nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile, olileanya m dị na gị.
Psalms 25:5 in English
Psalms 25:5 · Berean Standard Bible
Guide me in Your truth and teach me, for You are the God of my salvation; all day long I wait for You.
Context
3Ihere agaghị eme
onye ọbụla olileanya ya dị na gị,
ma ihere ga-eme ha
bụ ndị niile ịghọ aghụghọ jụrụ ahụ. 4O Onyenwe anyị, zi m ụzọ gị niile,
kuzikwaara m ụzọ gị niile. 5Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe,
nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile,
olileanya m dị na gị. 6Cheta, Onyenwe anyị, oke obi ebere na ịhụnanya gị,
nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie. 7Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m,
ya na nnupu isi m niile.
Kama site nʼịhụnanya gị cheta m,
Onyenwe anyị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.