Native Bible

Psalms 24:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Otu a ka ọ ga-adịrị ọgbọ ndị ya, bụ ndị na-achọ ihu gị, Chineke nke Jekọb. Sela

Psalms 24:6 in English

Psalms 24:6 · Berean Standard Bible

Such is the generation of those who seek Him, who seek Your face, O God of Jacob.* Selah

Context

4Ọ bụ onye aka ya emeghị ihe ọjọọ, obi ya dịkwa ọcha, onye na-adịghị atụkwasị obi na chi arụsị, maọbụ ṅụọ iyi aghụghọ. 5Ha ga-anata ngọzị site nʼaka Onyenwe anyị, natakwa mkpepụta site nʼaka Chineke Onye nzọpụta ha. 6Otu a ka ọ ga-adịrị ọgbọ ndị ya, bụ ndị na-achọ ihu gị, Chineke nke Jekọb. Sela 7Welitenụ isi unu, unu ọnụ ụzọ ama, meenụ ka isi unu bụrụ ihe e welitere, unu ọnụ ụzọ ama ochie, ka eze ebube nwee ike ịbata. 8Onye bụ eze ebube* a? Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dimkpa na dike. Ọ bụ Onyenwe anyị, onye bụ dike nʼagha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.