Abụ Ọma 23:3
Psalms 23:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
ọ na-atụte mkpụrụobi m. Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume nʼihi aha ya.
Psalms 23:3 in English
Psalms 23:3 · Berean Standard Bible
He restores my soul; He guides me in the paths of righteousness for the sake of His name.
Context
1Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m. 2Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto,
ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ, 3ọ na-atụte mkpụrụobi m.
Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume
nʼihi aha ya. 4A sịkwarị na m na-aga ije,
na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ,
agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla;
nʼihi na ị nọnyeere m,
mkpọrọ gị na mkpanaka gị
na-akasị m obi. 5Ị na-akwado tebul* nʼihu m,
nʼanya ndị iro m.
I tere isi m mmanụ*
iko m na-ejubiga oke.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.