Abụ Ọma 147:15
Psalms 147:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-ezipụ iwu ya nʼelu ụwa niile; okwu ya na-agbasa ngwangwa.
Psalms 147:15 in English
Psalms 147:15 · Berean Standard Bible
He sends forth His command to the earth; His word runs swiftly.
Context
13Nʼihi na o wusiela mkpọrọ ọnụ ụzọ ama gị niile ike,
na-agọzikwa ndị niile bi nʼime gị. 14Ọ na-eme ka oke ala gị nwee udo,
jirikwa ọka wiiti kachasị mma nyejuo gị afọ. 15Ọ na-ezipụ iwu ya nʼelu ụwa niile;
okwu ya na-agbasa ngwangwa. 16Ọ na-atụsa snoo nʼala dịka ajị anụ,
na-efesasị igirigi snoo dịka ntụ. 17Ọ na-atụdata mkpụrụ mmiri ya dị ka mkpụrụ okwute.
Onye pụrụ iguzogide oke ifufe oyi ya?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.