Abụ Ọma 145:3
Psalms 145:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto; ịdị ukwuu ya karịrị ihe onye ọbụla pụrụ ịghọta.
Psalms 145:3 in English
Psalms 145:3 · Berean Standard Bible
Great is the LORD and greatly to be praised; His greatness is unsearchable.
Context
1Aga m ebuli gị elu, Chineke m onye bụ eze;
aga m eto aha gị, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. 2Ụbọchị niile ka m ga-eto gị
jaakwa aha gị mma site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. 3Onyenwe anyị dị ukwuu, bụrụkwa onye kwesiri ịnata otuto;
ịdị ukwuu ya karịrị ihe onye ọbụla pụrụ ịghọta. 4Otu ọgbọ ga-eto ọrụ gị niile nʼihu ọgbọ ọzọ;
ha ga-ekwupụta maka ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche. 5Ha ga-ekwupụta ihe banyere ịdị ebube nke ịma mma gị,
aga m atụgharịkwa uche nʼọrụ ebube gị niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.