Native Bible

Psalms 14:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi, ọ dịghị ọ bụladị, otu onye.

Psalms 14:3 in English

Psalms 14:3 · Berean Standard Bible

All have turned away, they have together become corrupt;* there is no one who does good, not even one.*

Context

1Onye nzuzu na-asị* nʼime obi ya, “Ọ dịghị Chineke ọbụla dị.” Ha bụ ndị ajọ omume riri ahụ, ọrụ aka ha niile bụkwa ihe arụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ezi ihe. 2Onyenwe anyị sitere nʼeluigwe na-ele ụmụ mmadụ anya ịhụ ma ọ ga-achọta onye ọbụla nwere nghọta onye nke na-achọ Chineke. 3Mmadụ niile ewezugala onwe ha, ha niile abụrụla ndị ajọ omume riri ahụ; ọ dịghị onye ọbụla na-eme ihe ziri ezi, ọ dịghị ọ bụladị, otu onye. 4Ndị niile na-eme ajọ ihe, ha amaghị ihe? Ha na-eripịa ndị m dịka mmadụ si eri nri, ha adịghị akpọkukwa Onyenwe anyị. 5Ma nʼebe ahụ ka ha nọ, nʼọnọdụ oke egwu, nʼihi na Chineke nọ nʼetiti ndị ezi omume.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.