Abụ Ọma 135:3
Psalms 135:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Toonu Onyenwe anyị, nʼihi na Onyenwe anyị dị mma; bụkuo aha ya abụ otuto, nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi.
Psalms 135:3 in English
Psalms 135:3 · Berean Standard Bible
Hallelujah, for the LORD is good; sing praises to His name, for it is lovely.
Context
1Toonu Onyenwe anyị.
Toonu aha Onyenwe anyị,
toonu ya, unu ndị ohu Onyenwe anyị niile, 2unu ndị na-eje ozi nʼime ụlọ Onyenwe anyị,
nʼime ogige ụlọ Chineke anyị. 3Toonu Onyenwe anyị, nʼihi na Onyenwe anyị dị mma;
bụkuo aha ya abụ otuto, nʼihi na ọ bụ ihe ziri ezi. 4Nʼihi na Onyenwe anyị ahọpụtala Jekọb nye onwe ya,
ọ họpụtala Izrel ka ọ bụrụ ihe oke ọnụahịa nke aka ya. 5Amaara m na Onyenwe anyị dị ukwuu,
na Onyenwe anyị dị ukwuu karịa chi niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.