Abụ Ọma 135:10
Psalms 135:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O tigburu ọtụtụ mba dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, tigbukwaa ndị eze ha, ndị dị ike nʼagha.
Psalms 135:10 in English
Psalms 135:10 · Berean Standard Bible
He struck down many nations and slaughtered mighty kings:
Context
8O tigburu ụmụ niile e buru ụzọ mụọ nʼala Ijipt,
ụmụ mmadụ buru ụzọ mụọ na ụmụ anụ ụlọ e buru ụzọ mụọ. 9O zipụrụ ihe ịrịbama ya dị iche iche na ọrụ ebube ya niile nʼetiti unu, o Ijipt,
megide Fero na ndị niile na-ejere ya ozi. 10O tigburu ọtụtụ mba dị ukwuu nʼọnụọgụgụ,
tigbukwaa ndị eze ha, ndị dị ike nʼagha. 11Ụfọdụ nʼime ha bụ Saịhọn, eze ndị Amọrait,
na Ọg eze Bashan,
na ndị eze niile dị na Kenan. 12O weere ala ndị obodo ahụ niile nye ndị ya,
nye ya ụmụ Izrel dịka ihe nketa ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.