Abụ Ọma 107:41
Psalms 107:41 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ọ na-anapụta ndị mkpa na-akpa site na nhụju anya ha, mee ka ezinaụlọ ha mụbaa dịka igwe anụ ụlọ.
Psalms 107:41 in English
Psalms 107:41 · Berean Standard Bible
But He lifts the needy from affliction and increases their families like flocks.
Context
39Mgbe ahụ, ọnụọgụgụ ha adịghịkwa ka ọ dị na mbụ,
ha bụ ndị e ji mkpagbu na ihe ndakwasị na iru ụjụ wedata nʼala; 40onye ahụ na-eleda ndị na-achị achị anya
mere ka ha wagharịa nʼọzara, ebe ụzọ na-adịghị. 41Ma ọ na-anapụta ndị mkpa na-akpa site na nhụju anya ha,
mee ka ezinaụlọ ha mụbaa dịka igwe anụ ụlọ. 42Ndị ezi omume na-ahụ ya na-aṅụrị ọṅụ,
ma ndị ajọ omume na-emechi ọnụ ha nọọ duu. 43Onye ọbụla maara ihe ga-echezi echiche banyere ihe ndị a,
ma tuleekwa ọrụ ịhụnanya Onyenwe anyị nke dị ukwuu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.