Native Bible

Psalms 102:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

nʼihi oke iwe gị, i bulitela m, ma tụpụ m nʼakụkụ.

Psalms 102:10 in English

Psalms 102:10 · Berean Standard Bible

because of Your indignation and wrath, for You have picked me up and cast me aside.

Context

8Ụbọchị niile, ndị iro m na-eji m eme ihe ọchị; ndị na-akwa m emo na-eji aha m mere ihe ịbụ ọnụ. 9Nʼihi na ejirila m ntụ mere ihe oriri m, anya mmiri m na-agwakọta nʼiko ihe ọṅụṅụ m 10nʼihi oke iwe gị, i bulitela m, ma tụpụ m nʼakụkụ. 11Ụbọchị m niile dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ na-ada. Ana m akpọnwụ akpọnwụ, dịka ahịhịa. 12Ma gị Onyenwe anyị, na-anọgide nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi; aha gị ga-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.