Abụ Ọma 100:4
Psalms 100:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya jiri otuto baa nʼogige ya; keleenụ ya, tookwa aha ya.
Psalms 100:4 in English
Psalms 100:4 · Berean Standard Bible
Enter His gates with thanksgiving and His courts with praise; give thanks to Him and bless His name.
Context
2Jiri obi ụtọ fee Onyenwe anyị ofufe;
jirinụ ịbụ abụ ọṅụ bịa nʼihu ya 3Matanụ na Onyenwe anyị bụ Chineke.
Ọ bụ ya onwe ya kere anyị,* ọ bụkwa ya nwe anyị,
anyị bụ ndị ya, igwe atụrụ nke ọ na-azụ. 4Jirinụ ekele banye nʼọnụ ụzọ ama ya
jiri otuto baa nʼogige ya;
keleenụ ya, tookwa aha ya. 5Nʼihi na Onyenwe anyị dị mma, ịhụnanya ya na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi.
Ruo ọgbọ niile ka ikwesi ntụkwasị obi ya na-adịgidekwa.
100:3 Job 10:3; Efe 2:10
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.