Abụ Ọma 1:5
Psalms 1:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, ndị ajọ omume agaghị eguzosi ike nʼụbọchị ikpe; ndị mmehie agaghị eguzokwa na nzukọ ndị ezi omume.
Psalms 1:5 in English
Psalms 1:5 · Berean Standard Bible
Therefore the wicked will not stand in the judgment, nor sinners in the assembly of the righteous.
Context
3Ọ dị ka osisi a kụrụ nʼakụkụ iyi,
nke na-amịpụta mkpụrụ ya nʼoge ya,
nke ahịhịa ya na-adịghị akpọnwụ akpọnwụ.
Ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma. 4Ma ndị ajọ omume adịghị otu a.
Ha dị ka igbugbo ọka
nke oke ifufe na-efesasị. 5Ya mere, ndị ajọ omume agaghị eguzosi ike nʼụbọchị ikpe;
ndị mmehie agaghị eguzokwa na nzukọ ndị ezi omume. 6Nʼihi na Onyenwe anyị na-eche ụzọ ndị ezi omume nche.
Ma ụzọ ndị ajọ omume ga-eduba ha nʼịla nʼiyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.