Proverbs 9:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye ọbụla na-adọ onye na-akwa emo aka na ntị na-ewetara onwe ya nlelị; onye na-abara mmadụ ọjọọ mba na-enweta nkọcha.
Proverbs 9:7 in English
Proverbs 9:7 · Berean Standard Bible
He who corrects a mocker brings shame on himself; he who rebukes a wicked man taints himself.
Context
5“Bịanụ, rie nri m,
ṅụọkwa mmanya m gwakọtara. 6Hapụnụ ụzọ enweghị uche unu, ka unu were dị ndụ;
gbasokwanụ ụzọ mmụọ ịghọta ihe.” 7Onye ọbụla na-adọ onye na-akwa emo aka na ntị na-ewetara onwe ya nlelị;
onye na-abara mmadụ ọjọọ mba na-enweta nkọcha. 8Abarala ndị na-akwa emo mba, ma ọ bụghị ya, ha ga-akpọ gị asị;
baara ndị maara ihe mba, ha ga-ahụ gị nʼanya. 9Kuziere onye maara ihe ihe o kwesiri ịmụta, ọ ga-ama ihe karịa,
kuziere onye ziri ezi ihe ọ ga-atụkwasị ihe ọ mụtara nʼamamihe ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.