Ilu 9:10
Proverbs 9:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe, inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta.
Proverbs 9:10 in English
Proverbs 9:10 · Berean Standard Bible
The fear of the LORD is the beginning of wisdom, and knowledge of the Holy One is understanding.
Context
8Abarala ndị na-akwa emo mba, ma ọ bụghị ya, ha ga-akpọ gị asị;
baara ndị maara ihe mba, ha ga-ahụ gị nʼanya. 9Kuziere onye maara ihe ihe o kwesiri ịmụta, ọ ga-ama ihe karịa,
kuziere onye ziri ezi ihe ọ ga-atụkwasị ihe ọ mụtara nʼamamihe ya. 10Nʼihi na ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe,
inwe ihe ọmụma banyere onye Nsọ ahụ bụkwa nghọta. 11Nʼihi na ọ bụ site na amamihe, ka ụbọchị gị ga-adị ogologo.
A ga-etinyekwara gị ọtụtụ afọ na ndụ gị. 12Ị bụrụ onye nwere amamihe, amamihe gị ga-abara gị uru,
ma ị bụrụ onye na-akwa emo, naanị gị ga-ata ahụhụ ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.