Ilu 8:34
Proverbs 8:34 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ngọzị dịrị mmadụ ahụ na-aṅa ntị nʼokwu m, onye na-anọ na nche nʼọnụ ụzọ m ụbọchị niile, onye na-anọ na-echere m nʼọnụ ụzọ ụlọ m;
Proverbs 8:34 in English
Proverbs 8:34 · Berean Standard Bible
Blessed is the man who listens to me, watching daily at my doors, waiting at the posts of my doorway.
Context
32“Nʼihi ya, ụmụ m ndị ikom, geenụ m ntị;
nʼihi na ndị niile na-eso ụzọ m na-enwe ọṅụ. 33Gee ntị na ndụmọdụ m ka ị bụrụ onye maara ihe,
agbakụtakwala ndụmọdụ m azụ. 34Ngọzị dịrị mmadụ ahụ na-aṅa ntị nʼokwu m,
onye na-anọ na nche nʼọnụ ụzọ m ụbọchị niile,
onye na-anọ na-echere m nʼọnụ ụzọ ụlọ m; 35nʼihi na onye ọbụla chọtara m chọtara ndụ;
ọ natakwala ihuọma nʼebe Onyenwe anyị nọ. 36Ma onye na-enweghị ike chọta m na-emerụ onwe ya ahụ;
ndị niile kpọrọ m asị hụrụ ọnwụ nʼanya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.