Ilu 8:28
Proverbs 8:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
mgbe o hiwere mbara eluigwe, mgbe o mere ka isi iyi niile nke ogbu mmiri dị ike,
Proverbs 8:28 in English
Proverbs 8:28 · Berean Standard Bible
when He established the clouds above, when the fountains of the deep gushed forth,
Context
26E, amụọla m rịị tupu Chineke ekee ụwa
na osisi niile, na aja niile dị nʼime ya. 27Anọ m ya mgbe o doziri mbara eluigwe nʼọnọdụ ya,
mgbe ọ tụsara ha nʼelu ogbu mmiri niile; 28mgbe o hiwere mbara eluigwe,
mgbe o mere ka isi iyi niile nke ogbu mmiri dị ike, 29mgbe ọ kpara oke nye osimiri ebe ọ ga-akwụsị,
ka mmiri ya ghara ịgafe iwu ya,
mgbe ọ kara akara ebe a tọrọ ntọala nke ụwa. 30Oge ahụ niile ka m na-anọ nʼakụkụ ya dịka onye ǹka.
Ihe banyere m na-atọkwa ya ụtọ;
ana m egwuri egwu nʼihu ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.