Ilu 6:30
Proverbs 6:30 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị mmadụ adịghị eleda onye ohi anya ma ọ bụrụ na o zuo ohi ka o were gboo mkpa agụụ nke na-agụsị ya ike.
Proverbs 6:30 in English
Proverbs 6:30 · Berean Standard Bible
Men do not despise the thief if he steals to satisfy his hunger.
Context
28Mmadụ ọ pụrụ ije ije nʼelu icheku ọkụ
ma ụkwụ ya ahapụ igbuchapụ? 29Otu a ka ọ na-adịrị nwoke na-abakwuru nwunye mmadụ ibe ya;
o nweghị onye ọbụla na-emetụ ya aka nke a na-agaghị ata ahụhụ. 30Ndị mmadụ adịghị eleda onye ohi anya ma ọ bụrụ na o zuo ohi
ka o were gboo mkpa agụụ nke na-agụsị ya ike. 31Ma ọ bụrụ na ejide ya ọ ga-akwụghachi ụgwọ ihe niile ahụ o zuru okpukpu asaa.
Nʼagbanyeghị na nke a ga-eme ka o ree ihe niile o ji biri nʼụlọ ya. 32Ma nwoke ahụ na-akwa iko bụ onye nzuzu, amamihe kọrọ ya,
nʼihi na ọ bụ onwe ya ka ọ na-ala nʼiyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.