Proverbs 6:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mee nke a, nwa m, si nʼime ya wepụ onwe gị; nʼihi na ịdabala nʼaka onye agbataobi gị: Jee ọsịịsọ weda onwe gị nʼala rịọọ ya enyekwala ya izuike ọbụla.
Proverbs 6:3 in English
Proverbs 6:3 · Berean Standard Bible
then do this, my son, to free yourself, for you have fallen into your neighbor’s hands: Go, humble yourself,* and press your plea with your neighbor.
Context
1Nwa m, ọ bụrụ na ị nara onye agbataobi gị nʼibe,
ọ bụrụ na ị nara aka ị bụrụ onye ọbịa onye akaebe, 2ị bụrụla onye mara nʼọnya site nʼihe ị kwuru,
onye enwudere site nʼokwu ọnụ ya. 3Mee nke a, nwa m, si nʼime ya wepụ onwe gị;
nʼihi na ịdabala nʼaka onye agbataobi gị:
Jee ọsịịsọ weda onwe gị nʼala rịọọ ya
enyekwala ya izuike ọbụla. 4Ekwekwala ka ụra baa gị anya abụọ,
ekwekwala ka mbụbara anya gị ruo ụra. 5Napụta onwe gị, dịka mgbada site nʼaka dinta,
maọbụ dịka nnụnụ site nʼọnya osi ọnya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.