Native Bible

Proverbs 3:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nwa m echezọla ihe niile m ziri gị. Ma debe iwu m nʼobi gị.

Proverbs 3:1 in English

Proverbs 3:1 · Berean Standard Bible

My son, do not forget my teaching, but let your heart keep my commandments;

Context

1Nwa m echezọla ihe niile m ziri gị. Ma debe iwu m nʼobi gị. 2Nʼihi na ha ga-eme ka ndụ gị dị ogologo ruo ọtụtụ afọ, wetakwara gị udo na ọganihu. 3Ekwela ka ịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi hapụ gị, kekwasị ha nʼolu gị, deekwa ha nʼelu mbadamba nkume, bụ obi gị.*

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.