Ilu 26:3
Proverbs 26:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụtarị dịrị ịnyịnya, ịnyịnya ibu ka a na-ekenye mkpụmkpụ igwe nʼọnụ; otu a kwa ka apịpịa dị nye azụ ndị nzuzu.
Proverbs 26:3 in English
Proverbs 26:3 · Berean Standard Bible
A whip for the horse, a bridle for the donkey, and a rod for the backs of fools!
Context
1Ịhụ onye nzuzu a na-enye nsọpụrụ
dịka ịhụ mkpụrụ mmiri ka ọ na-ada nʼoge ọkọchị maọbụ mmiri na-ezo nʼoge owuwe ihe ubi. 2Dịka nnụnụ nta na-efegharị efegharị, maọbụ dịka eleke na-awụgharị
otu a ka ọbụbụ ọnụ na-ekwesighị agaghị ere. 3Ụtarị dịrị ịnyịnya, ịnyịnya ibu ka a na-ekenye mkpụmkpụ igwe nʼọnụ;
otu a kwa ka apịpịa dị nye azụ ndị nzuzu. 4A zaghachila onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị,
ma ọ bụghị ya gị onwe gị ga-adị ka ya. 5Zaa onye nzuzu dịka enweghị uche ya si dị,
ma ọ bụghị ya ọ ga-abụ onye maara ihe nʼanya onwe ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.