Native Bible

Proverbs 26:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ịhụ onye nzuzu a na-enye nsọpụrụ dịka ịhụ mkpụrụ mmiri ka ọ na-ada nʼoge ọkọchị maọbụ mmiri na-ezo nʼoge owuwe ihe ubi.

Proverbs 26:1 in English

Proverbs 26:1 · Berean Standard Bible

Like snow in summer and rain at harvest, honor does not befit a fool.

Context

1Ịhụ onye nzuzu a na-enye nsọpụrụ dịka ịhụ mkpụrụ mmiri ka ọ na-ada nʼoge ọkọchị maọbụ mmiri na-ezo nʼoge owuwe ihe ubi. 2Dịka nnụnụ nta na-efegharị efegharị, maọbụ dịka eleke na-awụgharị otu a ka ọbụbụ ọnụ na-ekwesighị agaghị ere. 3Ụtarị dịrị ịnyịnya, ịnyịnya ibu ka a na-ekenye mkpụmkpụ igwe nʼọnụ; otu a kwa ka apịpịa dị nye azụ ndị nzuzu.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.