Ilu 24:10
Proverbs 24:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na ị pụghị iguzosi ike nʼoge nsogbu, ị bụ nnọọ onye ike ya dị ntakịrị.
Proverbs 24:10 in English
Proverbs 24:10 · Berean Standard Bible
If you faint in the day of distress, how small is your strength!
Context
8Onye na-eche echiche ime ihe ọjọọ
ka a ga-agụ dịka onye nzube ihe ọjọọ 9Nzube niile nke onye na-enweghị uche bụ mmehie,
ndị mmadụ na-akpọ onye na-akwa emo asị. 10Ọ bụrụ na ị pụghị iguzosi ike nʼoge nsogbu,
ị bụ nnọọ onye ike ya dị ntakịrị. 11Napụta ndị a na-eduba nʼọnwụ.
Napụtakwa ndị ahụ a mara ikpe ọnwụ nʼụzọ na-ezighị ezi. 12Ọ bụrụ na ị sị, “Anyị amaghị banyere ihe ndị a,”
ọ bụ na onye na-enyocha obi aghọtaghị ya?
Ọ bụ na onye na-eche ndụ gị amaghị ya?
Ọ bụ na ọ gaghị akwụghachi onye ọbụla ụgwọ dịka akaọrụ ya siri dị?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.