Ilu 17:2
Proverbs 17:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ohu nwere uche ga-achị nwa nna ya ukwu na-eweta ihere ma ketakwa oke nʼihe nketa dịka otu nʼime ndị ezinaụlọ ahụ.
Proverbs 17:2 in English
Proverbs 17:2 · Berean Standard Bible
A wise servant will rule over a disgraceful son and share his inheritance as one of the brothers.
Context
1Ọ ka mma ịta iberibe achịcha kpọrọ nkụ ma ịnọ nʼudo adị ya,
karịa nʼụlọ jupụtara nʼoke oriri na ịlụ ọgụ. 2Ohu nwere uche ga-achị nwa nna ya ukwu na-eweta ihere
ma ketakwa oke nʼihe nketa dịka otu nʼime ndị ezinaụlọ ahụ. 3Ite eji anụcha ihe dịrị ọlaọcha, oke ọkụ dịkwara ọlaedo
ma Onyenwe anyị na-anwale obi. 4Ajọ mmadụ na-aṅa ntị nʼegbugbere ọnụ na-eduhie,
onye ụgha na-aṅakwa ntị nye ire na-ekwu okwu ịla nʼiyi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.