Ilu 12:23
Proverbs 12:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onye nwere uche na-edebe ihe ọmụma ha nye onwe ha, ma onye nzuzu na-agbasa enweghị uche ya nʼanwụ.*
Proverbs 12:23 in English
Proverbs 12:23 · Berean Standard Bible
A shrewd man keeps his knowledge to himself, but a foolish heart proclaims its folly.
Context
21Ihe ọjọọ anaghị adakwasị onye ezi omume,
ma ndị ajọ omume enwetala nsogbu ebe ọ dị ukwuu. 22Onyenwe anyị kpọrọ egbugbere ọnụ nʼagha ụgha asị,
ma ihe ndị kwesiri ntụkwasị obi na-amasị ya. 23Onye nwere uche na-edebe ihe ọmụma ha nye onwe ha,
ma onye nzuzu na-agbasa enweghị uche ya nʼanwụ.* 24Aka na-arụsị ọrụ ike ga-achị achị,
ma umengwụ ga-akwụsị naanị nʼọrụ mmanye. 25Obi nke jupụtara na nchegbu na-ada mba,
ma okwu ọma na-eme ka obi ṅụrịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.