Native Bible

Philippians 3:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mụ onwe m nwere ike nwee ntụkwasị obi nʼihe ndị a. Nʼihi na e nwee onye chere na ọ pụrụ ịtụkwasị obi ya nʼanụ ahụ, mụ onwe m nwere ụdị ntụkwasị obi ahụ karịa onye ahụ:

Philippians 3:4 in English

Philippians 3:4 · Berean Standard Bible

though I myself could have such confidence. If anyone else thinks he has grounds for confidence in the flesh, I have more:

Context

2Kpachapụrụnụ onwe unu anya nʼebe ndị mmadụ ọjọọ ahụ yiri nkịta nọ. Ndị ahụ na-eyiwasị ahụ ha. 3Nʼihi na ọ bụ anyị bụ ndị ezi obibi ugwu ahụ, ọ bụghị ha, nʼihi na anyị bụ ndị na-efe Chineke site na Mmụọ ya. Anyị na-aṅụrị ọṅụ nʼime Kraịst Jisọs. Anyị adịghị atụkwasị obi nʼihe e mere nʼanụ ahụ. 4Mụ onwe m nwere ike nwee ntụkwasị obi nʼihe ndị a. Nʼihi na e nwee onye chere na ọ pụrụ ịtụkwasị obi ya nʼanụ ahụ, mụ onwe m nwere ụdị ntụkwasị obi ahụ karịa onye ahụ: 5e biri m ugwu nʼabalị nke asatọ site na mgbe a mụrụ m, abụ m onye Izrel, sitere nʼagbụrụ Benjamin; abụ m onye Hibru a mụrụ nʼetiti ndị Hibru; dị ka o si metụta iwu abụ m onye Farisii; 6igosi ịnụ ọkụ nʼobi m, akpagburu m chọọchị, nʼụzọ ezi omume nʼokpuru iwu, abụ m onye zuruoke.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.