Fịlịmọn 1:15
Philemon 1:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma eleghị anya, ọ bụ nʼihi nke a ka eji kewapụ ya nwa oge nta site nʼebe ị nọ, bụ ka i mesịa nweghachi ya ebighị ebi.
Philemon 1:15 in English
Philemon 1:15 · Berean Standard Bible
For perhaps this is why he was separated from you for a while, so that you might have him back for good—
Context
13Ọ gụsịrị m agụụ ike ime ka mụ na ya nọdụ nʼebe a, ka o were ọnọdụ gị na-ejere m ozi ọ bụladị dị ka m nọ na mkpọrọ nʼihi oziọma. 14Ma, a chọghị m ime ihe ọbụla na-enwetaghị nkwenye gị, ka ọ ghara ịdị ka i mere obiọma gị na mmanye. Kama, achọrọ m ka i mee ihe si gị nʼobi pụta. 15Ma eleghị anya, ọ bụ nʼihi nke a ka eji kewapụ ya nwa oge nta site nʼebe ị nọ, bụ ka i mesịa nweghachi ya ebighị ebi. 16Ọ bụghịkwa ohu ọzọ, kama ọ karịrị ohu, maka ọ dịka nwanna a hụrụ nʼanya, ọkachasị nʼebe mụ onwe m nọ, ma ọ ga-abụkwara gị karịchasịa, ma nʼanụ ahụ nakwa nʼime Onyenwe anyị. 17Nʼihi nke a, ọ bụrụ na ị gụrụ m dị ka onye nnwekọ ihe, nabata ya dị ka ị ga-esi nabata m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.