Native Bible

Philemon 1:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ana m ezighachiri gị ya ugbu a, ya bụ, onye bụ obi* m ka m na-ezitere gị.

Philemon 1:12 in English

Philemon 1:12 · Berean Standard Bible

I am sending back to you him who is my very heart.

Context

10Biko, arịọ m gị nʼisi Onisimọs, onye e mere ka ọ bụrụ nwa m oge m nọ nʼụlọ mkpọrọ. 11Na mbụ, o nweghị uru ọbụla ọ baara gị, ma ugbu a, ọ baara mụ na gị uru. 12Ana m ezighachiri gị ya ugbu a, ya bụ, onye bụ obi* m ka m na-ezitere gị. 13Ọ gụsịrị m agụụ ike ime ka mụ na ya nọdụ nʼebe a, ka o were ọnọdụ gị na-ejere m ozi ọ bụladị dị ka m nọ na mkpọrọ nʼihi oziọma. 14Ma, a chọghị m ime ihe ọbụla na-enwetaghị nkwenye gị, ka ọ ghara ịdị ka i mere obiọma gị na mmanye. Kama, achọrọ m ka i mee ihe si gị nʼobi pụta.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.