Ọnụọgụgụ 7:60
Numbers 7:60 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼụbọchị nke itoolu, Abidan nwa Gidiọn onyendu ebo Benjamin nyere onyinye nke ya.
Numbers 7:60 in English
Numbers 7:60 · Berean Standard Bible
On the ninth day Abidan son of Gideoni, the leader of the Benjamites, drew near.
Context
58O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, 59ehi abụọ, ebule ise, mkpi ise na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.
Nke a bụ onyinye Gamaliel nwa Pedazo nyere. 60Nʼụbọchị nke itoolu, Abidan nwa Gidiọn onyendu ebo Benjamin nyere onyinye nke ya. 61Onyinye o wetara bụ:
otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka. 62O wetara otu efere ọlaedo, nke ịdị arọ ya bụ shekel iri. A wụjuru efere a ụda na-esi isi ụtọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.