Ọnụọgụgụ 7:23
Numbers 7:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
na ehi abụọ, na ebule ise, mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo. Nke a bụ onyinye Netanel nwa Zua.
Numbers 7:23 in English
Numbers 7:23 · Berean Standard Bible
and a peace offering of two oxen, five rams, five male goats, and five male lambs a year old. This was the offering of Nethanel son of Zuar.
Context
21O wetakwara otu oke ehi, otu ebule, otu nwa ebule gbara otu afọ maka aja nsure ọkụ. 22O wetakwara otu mkpi maka aja mmehie, 23na ehi abụọ, na ebule ise, mkpi ise, na ụmụ ebule ise gbara otu afọ, otu afọ, ka a chụọ maka aja udo.
Nke a bụ onyinye Netanel nwa Zua. 24Nʼụbọchị nke atọ Eliab nwa Helọn onyendu ebo Zebụlọn wetakwara onyinye nke ya. 25Onyinye o wetara bụ:
otu efere ọlaọcha nke ịdị arọ ya bụ narị shekel na iri shekel atọ, na otu efere ịkwọsa mmiri e ji ọlaedo kpụọ, nke ịdị arọ ya bụ iri shekel asaa, efere abụọ ndị a bụ nʼusoro dịka shekel ebe nsọ si dị. A wụjuru efere ọbụla ezi ụtụ ọka a gwara mmanụ dịka onyinye mkpụrụ ọka.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.