Native Bible

Numbers 5:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Onye dị otu a aghaghị ikwupụta mmehie ya, kwụghachi onye ahụ o mejọrọ ihe iwu kwuru na ọ ga-akwụ. Ọ ga-atụkwasị nʼelu ihe ọ na-akwụghachi onye ahụ o mejọrọ ego ọzọ ruru otu ụzọ nʼụzọ ise.

Numbers 5:7 in English

Numbers 5:7 · Berean Standard Bible

and must confess the sin he has committed. He must make full restitution, add a fifth to its value, and give all this to the one he has wronged.

Context

5Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 6“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Mgbe onye ọbụla, nwoke maọbụ nwanyị, mejọrọ mmadụ ibe ya nʼụzọ ọbụla, si otu a bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị bụ onye ikpe mara. 7Onye dị otu a aghaghị ikwupụta mmehie ya, kwụghachi onye ahụ o mejọrọ ihe iwu kwuru na ọ ga-akwụ. Ọ ga-atụkwasị nʼelu ihe ọ na-akwụghachi onye ahụ o mejọrọ ego ọzọ ruru otu ụzọ nʼụzọ ise. 8Ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị onye ikwu ya bụ onye a ga-akwụghachi ụgwọ nʼihi mejọọ ahụ, ihe ịkwụghachi ụgwọ ahụ ga-abụ nke Onyenwe anyị, aghaghị inye onye nchụaja. A ga-atụkwasịkwa ya ebule a ga-eji chụọ aja mkpuchi mmehie nʼihi onye ahụ mehiere. 9Onyinye niile dị nsọ ndị Izrel wetaara onye nchụaja bụ nke onye nchụaja ahụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.