Native Bible

Numbers 5:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Mgbe onye ọbụla, nwoke maọbụ nwanyị, mejọrọ mmadụ ibe ya nʼụzọ ọbụla, si otu a bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị bụ onye ikpe mara.

Numbers 5:6 in English

Numbers 5:6 · Berean Standard Bible

“Tell the Israelites that when a man or woman acts unfaithfully against the LORD by committing any sin against another, that person is guilty

Context

4Ndị Izrel mezuru iwu a, site nʼetiti ha kpọpụ ndị dị otu a, dịka Onyenwe anyị nyere Mosis nʼiwu. 5Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 6“Gwa ụmụ Izrel okwu sị ha, ‘Mgbe onye ọbụla, nwoke maọbụ nwanyị, mejọrọ mmadụ ibe ya nʼụzọ ọbụla, si otu a bụrụ onye na-ekwesighị ntụkwasị obi nye Onyenwe anyị bụ onye ikpe mara. 7Onye dị otu a aghaghị ikwupụta mmehie ya, kwụghachi onye ahụ o mejọrọ ihe iwu kwuru na ọ ga-akwụ. Ọ ga-atụkwasị nʼelu ihe ọ na-akwụghachi onye ahụ o mejọrọ ego ọzọ ruru otu ụzọ nʼụzọ ise. 8Ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị onye ikwu ya bụ onye a ga-akwụghachi ụgwọ nʼihi mejọọ ahụ, ihe ịkwụghachi ụgwọ ahụ ga-abụ nke Onyenwe anyị, aghaghị inye onye nchụaja. A ga-atụkwasịkwa ya ebule a ga-eji chụọ aja mkpuchi mmehie nʼihi onye ahụ mehiere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.