Ọnụọgụgụ 4:7
Numbers 4:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Nʼelu tebul ahụ na-adị nʼihu Onyenwe anyị, ha ga-agbasa akwa anụnụ anụnụ tụkwasịkwa efere niile, ngaji niile, ọkwa niile na iko aja ihe ọṅụṅụ. Achịcha ahụ na-adịgide nʼelu ya ga-adịkwa ebe ọ dị.
Numbers 4:7 in English
Numbers 4:7 · Berean Standard Bible
Over the table of the Presence they are to spread a blue cloth and place the plates and cups on it, along with the bowls and pitchers for the drink offering. The regular bread offering is to remain on it.
Context
5Mgbe ọmụma ụlọ ikwu ahụ ga-ebili ije ha, Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eburu ụzọ banye nʼụlọ nzute ahụ wetuo akwa mgbochi ahụ, jiri ya kpuchie igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ. 6Mgbe ahụ, ha ga-agbakwasị akpụkpọ anụ ehi mmiri nʼelu akwa mgbochi ahụ, sakwasịkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ* nʼelu ya, tinyekwa mkpọrọ osisi niile nʼoghere ha kwesiri ịdị. 7“Nʼelu tebul ahụ na-adị nʼihu Onyenwe anyị, ha ga-agbasa akwa anụnụ anụnụ tụkwasịkwa efere niile, ngaji niile, ọkwa niile na iko aja ihe ọṅụṅụ. Achịcha ahụ na-adịgide nʼelu ya ga-adịkwa ebe ọ dị. 8Ha ga-agbasakwa akwa uhie nʼelu ya, jiri akpụkpọ anụ ehi mmiri gbokwasịkwa nʼelu akwa uhie ahụ. Mgbe ahụ, ha ga-etinyekwa mkpọrọ osisi e ji ebu tebul nʼime oghere o kwesiri ịdị. 9“Ọzọ, ha ga-eji akwa anụnụ anụnụ sachie ihe ịdọba oriọna ahụ nke na-enye ìhè, ya na oriọna ya niile, mkpa ya niile na ihe ịkpakepụ ọkụ ya niile na ite mmanụ ya niile, e ji awụnye ya mmanụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.