Native Bible

Numbers 4:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ọmụma ụlọ ikwu ahụ ga-ebili ije ha, Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eburu ụzọ banye nʼụlọ nzute ahụ wetuo akwa mgbochi ahụ, jiri ya kpuchie igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ.

Numbers 4:5 in English

Numbers 4:5 · Berean Standard Bible

Whenever the camp sets out, Aaron and his sons are to go in, take down the veil of the curtain, and cover the ark of the Testimony * with it.

Context

3Gụọ ndị ikom niile gbarala iri afọ atọ ruo iri afọ ise, ndị tozuru ije ozi nʼụlọ nzute. 4“Nke a bụ ọrụ dịrị ndị Kohat nʼụlọ nzute, ilekọta ihe ndị ahụ kachasị ịdị nsọ. 5Mgbe ọmụma ụlọ ikwu ahụ ga-ebili ije ha, Erọn na ụmụ ya ndị ikom ga-eburu ụzọ banye nʼụlọ nzute ahụ wetuo akwa mgbochi ahụ, jiri ya kpuchie igbe iwu ọgbụgba ndụ ahụ. 6Mgbe ahụ, ha ga-agbakwasị akpụkpọ anụ ehi mmiri nʼelu akwa mgbochi ahụ, sakwasịkwa akwa na-acha anụnụ anụnụ* nʼelu ya, tinyekwa mkpọrọ osisi niile nʼoghere ha kwesiri ịdị. 7“Nʼelu tebul ahụ na-adị nʼihu Onyenwe anyị, ha ga-agbasa akwa anụnụ anụnụ tụkwasịkwa efere niile, ngaji niile, ọkwa niile na iko aja ihe ọṅụṅụ. Achịcha ahụ na-adịgide nʼelu ya ga-adịkwa ebe ọ dị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.