Native Bible

Numbers 4:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọrụ ha niile, maọbụ ibu ihe ma ọ bụkwanụ ịrụ ọrụ ọzọ, ga-abụ site na ntụziaka Erọn na ụmụ ya. Ị ga-ekenye ha ọrụ dịrị ha nʼihe niile bụ ihe ha ga-ebu.

Numbers 4:27 in English

Numbers 4:27 · Berean Standard Bible

All the service of the Gershonites—all their transport duties and other work—is to be done at the direction of Aaron and his sons; you are to assign to them all that they are responsible to carry.

Context

25Ha ga-ebu akwa mgbochi ebe obibi ahụ na nke ụlọ nzute ahụ, tinyere akwa e ji sachie ya na akpụkpọ anụ ehi mmiri e ji mee elu ụlọ ya na akwa mgbochi dị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. 26Ha ga-ebukwa akwa mgbochi niile e ji gechie ogige ahụ, akwa e ji gechie ọnụ ụzọ ama ogige gbara ebe ịchụ aja na ụlọ nzute ahụ gburugburu, ụdọ ya niile na ngwongwo niile e ji eje ozi. 27Ọrụ ha niile, maọbụ ibu ihe ma ọ bụkwanụ ịrụ ọrụ ọzọ, ga-abụ site na ntụziaka Erọn na ụmụ ya. Ị ga-ekenye ha ọrụ dịrị ha nʼihe niile bụ ihe ha ga-ebu. 28Nke a bụ ọrụ dịịrị ikwu Geshọn nʼụlọ nzute. Ha ga-anọ nʼokpuru Itama, nwa Erọn, onye nchụaja, onye bụ onyeisi ha. 29“Gụọ, chọpụta ọnụọgụgụ ụmụ Merari dịka ikwu ha na ezinaụlọ ha si dị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.