Ọnụọgụgụ 4:26
Numbers 4:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ha ga-ebukwa akwa mgbochi niile e ji gechie ogige ahụ, akwa e ji gechie ọnụ ụzọ ama ogige gbara ebe ịchụ aja na ụlọ nzute ahụ gburugburu, ụdọ ya niile na ngwongwo niile e ji eje ozi.
Numbers 4:26 in English
Numbers 4:26 · Berean Standard Bible
the curtains of the courtyard, and the curtains for the entrance at the gate of the courtyard that surrounds the tabernacle and altar, along with their ropes and all the equipment for their service. The Gershonites will do all that needs to be done with these items.
Context
24“Ihe ga-abụ ọrụ ndị ikwu Geshọn ga-abụ ije ozi na ibu ibu. 25Ha ga-ebu akwa mgbochi ebe obibi ahụ na nke ụlọ nzute ahụ, tinyere akwa e ji sachie ya na akpụkpọ anụ ehi mmiri e ji mee elu ụlọ ya na akwa mgbochi dị nʼọnụ ụzọ ụlọ nzute ahụ. 26Ha ga-ebukwa akwa mgbochi niile e ji gechie ogige ahụ, akwa e ji gechie ọnụ ụzọ ama ogige gbara ebe ịchụ aja na ụlọ nzute ahụ gburugburu, ụdọ ya niile na ngwongwo niile e ji eje ozi. 27Ọrụ ha niile, maọbụ ibu ihe ma ọ bụkwanụ ịrụ ọrụ ọzọ, ga-abụ site na ntụziaka Erọn na ụmụ ya. Ị ga-ekenye ha ọrụ dịrị ha nʼihe niile bụ ihe ha ga-ebu. 28Nke a bụ ọrụ dịịrị ikwu Geshọn nʼụlọ nzute. Ha ga-anọ nʼokpuru Itama, nwa Erọn, onye nchụaja, onye bụ onyeisi ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.