Native Bible

Numbers 36:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼoge ahụ, ndịisi ezi agbụrụ Gilead, nwa Makia, nwa Manase, otu nʼime ụmụ Josef, bịakwutere Mosis na ndị ndu, na ndịisi ezi ụmụ Izrel sị ha:

Numbers 36:1 in English

Numbers 36:1 · Berean Standard Bible

Now the family heads of the clan of Gilead son of Machir son of Manasseh, one of the clans of Joseph, approached Moses and the leaders who were the heads of the Israelite families and addressed them,

Context

1Nʼoge ahụ, ndịisi ezi agbụrụ Gilead, nwa Makia, nwa Manase, otu nʼime ụmụ Josef, bịakwutere Mosis na ndị ndu, na ndịisi ezi ụmụ Izrel sị ha: 2“Mgbe Onyenwe anyị nyere unu onyenwe m iwu inye ụmụ Izrel ala ahụ nʼihe nketa site nʼife nza, onye nyekwara gị iwu iwere ihe nketa nwanne anyị nwoke Zelofehad nyefee nʼaka ụmụ ya ndị inyom. 3Ugbu a, ọ bụrụ na ha alụọ ndị ikom Izrel si nʼebo ọzọ, mgbe ahụ, ihe nketa ha ga-abụ nke anapụrụ anyị, tụkwasị nʼihe nketa nke ebo ebe ha lụrụ di. Nʼụzọ dị otu a, ihe nketa anyị ga-abụ nke e wepụrụ ihe site na ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.