Ọnụọgụgụ 33:9
Numbers 33:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ha hapụrụ Mara, ha batara Elim, ebe e nwere mmiri iri na abụọ si nʼala na-asọpụta, na iri osisi nkwụ asaa. Ha nọrọ ọdụ dị ukwuu nʼebe a.
Numbers 33:9 in English
Numbers 33:9 · Berean Standard Bible
They set out from Marah and came to Elim, where there were twelve springs and seventy palm trees, and they camped there.
Context
7Ha hapụrụ Etam laghachi azụ gaa Pi Hahirot, nke dị nso nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ Baal-Zefọn, ebe ha manyere ụlọ ikwu ha na ndịda ugwu Migdol. 8Mgbe ha hapụrụ Pi Hahirot, ha sitere nʼetiti Osimiri Uhie gafee gaa ije ụbọchị atọ bata nʼọzara Etam. Ha manyere ụlọ ikwu ha na Mara. 9Mgbe ha hapụrụ Mara, ha batara Elim, ebe e nwere mmiri iri na abụọ si nʼala na-asọpụta, na iri osisi nkwụ asaa. Ha nọrọ ọdụ dị ukwuu nʼebe a. 10Mgbe ha hapụrụ Elim, ha wuru ụlọ ikwu ha nʼakụkụ Osimiri Uhie. 11Emesịa, ha hapụrụ Osimiri Uhie gaa maa ụlọ ikwu ha nʼọzara a na-akpọ Sin.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.