Ọnụọgụgụ 32:40
Numbers 32:40 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, Mosis were obodo Gilead nye Makia, ụmụ Manase ka ha biri nʼebe ahụ.
Numbers 32:40 in English
Numbers 32:40 · Berean Standard Bible
So Moses gave Gilead to the clan of Machir son of Manasseh, and they settled there.
Context
38Nebo na Baal-Meon (ma a gbanwere aha ha) na Sibma. Ha gbanwere aha obodo niile ndị ahụ ha wugharịrị, gụọ ha aha ọhụrụ. 39Ndị agbụrụ Makia, nwa Manase gara nʼobodo Gilead lụgbuo ya, chụpụ ndị Amọrait bi nʼebe ahụ. 40Ya mere, Mosis were obodo Gilead nye Makia, ụmụ Manase ka ha biri nʼebe ahụ. 41Jia, onye sikwa nʼebo Manase gara buso ọtụtụ obodo nta ndị ọzọ agha, lụgbuo ha. Ọ gbanwere aha obodo nta ndị a, gụọ ha Havọt Jaịa. 42Nʼoge a kwa, otu nwoke a na-akpọ Nọba duuru ndị agha gaa nʼobodo Kenat, na nʼobodo nta ndị ọzọ gbara ya gburugburu, lụgbuo ha, bichie nʼime ha. Ọ gbanwere aha obodo ndị ahụ niile bido ịkpọ ha Nọba, nke bụ aha ya onwe ya.
32:12 Nkọwa e nyere banyere akwụkwọ Jenesis isi nke 15:19, nakwa nʼisi nke 36:11, mere ka anyị mata na ndị Keniz bụ ndị Kenan. Ha bụ ndị si nʼagbụrụ Ịsọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.