Native Bible

Numbers 31:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel okwu sị, “Kwadoonụ ndị ikom unu ibuso ndị Midia agha, maka ịbọtara Onyenwe anyị ọbọ.

Numbers 31:3 in English

Numbers 31:3 · Berean Standard Bible

So Moses told the people, “Arm some of your men for war, that they may go against the Midianites and execute the LORD’s vengeance on them.

Context

1Mgbe ahụ, Onyenwe anyị gwara Mosis okwu sị ya, 2“Taa ndị Midia ahụhụ, ka i si otu a bọọrọ ndị Izrel ọbọ ihe ọjọọ ndị Midia mere ha. Mgbe i mesịrị nke a, ị ga-anwụ.” 3Ya mere, Mosis gwara ndị Izrel okwu sị, “Kwadoonụ ndị ikom unu ibuso ndị Midia agha, maka ịbọtara Onyenwe anyị ọbọ. 4Sinụ nʼebo ọbụla dị nʼIzrel gụpụta puku ndị ikom puku ndị ikom.” 5Ya mere, e sitere nʼigwe ndị ikom niile nọ nʼIzrel zipụ puku ndị ikom iri na abụọ, ka ha gaa buo agha. Ebo ọbụla zipụrụ otu puku ndị ikom.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.