Ọnụọgụgụ 31:23
Numbers 31:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
na ihe ọ bụla ọzọ bụ nke ga-anagide ọkụ, ka a ga-eme ka ọ gabiga site nʼọkụ, mgbe ahụ ọ ga-adịkwa ọcha. Ma aghaghị ịga nʼihu ime ka ha dị ọcha site nʼịsacha ha nʼime mmiri nke nsacha. Ma ihe ọbụla nke na-agaghị anagide ọkụ ka a ga-eji mmiri sachaa, maka ido ya ọcha.
Numbers 31:23 in English
Numbers 31:23 · Berean Standard Bible
everything that can withstand the fire—must be put through the fire, and it will be clean. But it must still be purified with the water of purification. And everything that cannot withstand the fire must pass through the water.
Context
21Mgbe ahụ, Elieza onye nchụaja gwara ndị ikom niile ahụ jere agha okwu sị ha, “Nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere Mosis. 22Otu ọ dị ọlaedo, ọlaọcha, bronz, igwe, gbamgbam na opu, 23na ihe ọ bụla ọzọ bụ nke ga-anagide ọkụ, ka a ga-eme ka ọ gabiga site nʼọkụ, mgbe ahụ ọ ga-adịkwa ọcha. Ma aghaghị ịga nʼihu ime ka ha dị ọcha site nʼịsacha ha nʼime mmiri nke nsacha. Ma ihe ọbụla nke na-agaghị anagide ọkụ ka a ga-eji mmiri sachaa, maka ido ya ọcha. 24Nʼụbọchị nke asaa, unu aghaghị ịsacha uwe unu niile, bụrụ ndị dị ọcha. Mgbe ahụ, unu pụrụ ịlọghachi nʼọmụma ụlọ ikwu ndị Izrel.” 25Ma Onyenwe anyị sịrị Mosis,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.