Ọnụọgụgụ 31:21
Numbers 31:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Elieza onye nchụaja gwara ndị ikom niile ahụ jere agha okwu sị ha, “Nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere Mosis.
Numbers 31:21 in English
Numbers 31:21 · Berean Standard Bible
Then Eleazar the priest said to the soldiers who had gone into battle, “This is the statute of the law which the LORD has commanded Moses:
Context
19“Ma ugbu a, unu niile bụ ndị soro gbuo mmadụ, maọbụ bitụ ozu ha aka, unu abatala nʼime ogige Izrel tutu ụbọchị asaa agafee. Nʼoge a, doonụ onwe unu ọcha, dokwaanụ ndị niile unu dọtara nʼagha ọcha, nʼụbọchị nke atọ na nʼụbọchị nke asaa. 20Debekwanụ uwe niile ọcha, ya na ihe niile e ji akpụkpọ anụ na ajị ewu, maọbụ osisi, mee.” 21Mgbe ahụ, Elieza onye nchụaja gwara ndị ikom niile ahụ jere agha okwu sị ha, “Nke a bụ iwu Onyenwe anyị nyere Mosis. 22Otu ọ dị ọlaedo, ọlaọcha, bronz, igwe, gbamgbam na opu, 23na ihe ọ bụla ọzọ bụ nke ga-anagide ọkụ, ka a ga-eme ka ọ gabiga site nʼọkụ, mgbe ahụ ọ ga-adịkwa ọcha. Ma aghaghị ịga nʼihu ime ka ha dị ọcha site nʼịsacha ha nʼime mmiri nke nsacha. Ma ihe ọbụla nke na-agaghị anagide ọkụ ka a ga-eji mmiri sachaa, maka ido ya ọcha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.