Ọnụọgụgụ 30:11
Numbers 30:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
di ya nụ ihe banyere ya, ma gba nkịtị maọbụ ogbochighị ya, mgbe ahụ, ịṅụ iyi na nkwa ndị ahụ niile nke o kwere ga-eguzo.
Numbers 30:11 in English
Numbers 30:11 · Berean Standard Bible
and her husband hears of it but says nothing to her and does not prohibit her, then all the vows or pledges by which she has bound herself shall stand.
Context
9“Ma nkwa ọbụla nke nwanyị di ya nwụrụ maọbụ nwanyị ya na di ya kewara, ihe ọbụla nke o ji ọnụ ya kwuo ka ọ ghaghị imezu. 10“Ma ọ bụrụ na nwanyị ya na di ya bi e kwee nkwa maọbụ site na kwagide ṅụọ iyi, 11di ya nụ ihe banyere ya, ma gba nkịtị maọbụ ogbochighị ya, mgbe ahụ, ịṅụ iyi na nkwa ndị ahụ niile nke o kwere ga-eguzo. 12Ma ọ bụrụ na di ya jụrụ ikwenye ka nkwa ahụ dịgide nʼụbọchị mbụ ọ nụrụ ya, nkwa ahụ maọbụ ọṅụṅụ iyi ahụ aghọọla ihe efu. Onyenwe anyị ga-agbaghakwara ya. 13Ya mere, di ya nwere ike ịjụ, maọbụ mesie nkwa ahụ, maọbụ iyi ahụ ọ ṅụrụ ike.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.